15. Jehova we si ya, N'ihi nka onye ọ bula nke nēb͕u Ken, okpukpu asa ka agābọ ọ́bọ̀ n'aru ya. Jehova we doro Ken ihe-iriba-ama, ka onye ọ bula nke nāhu ya we ghara itib͕u ya.
16. Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden.
17. Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.
18. Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek.
19. Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila.
20. Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo.