6. Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.
7. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.
8. Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.
9. Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.
10. Ma ihe ọ mere jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwu kwa.
11. Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.