Jenesis 38:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.

5. Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.

6. Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.

7. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.

8. Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.

9. Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.

Jenesis 38