22. O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:
23. umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:
24. umu-ndikom Rechel; Josef na Benjamin:
25. umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali: