19. Rechel we nwua, elìe ya n'uzọ Efrat (nke ahu bu Bet-lehem).
20. Jekob we guzo ogidi ọtọ n'elu ílì-ya: nke ahu bu Ogidi ílì Rechel rue ta.
21. Israel we bulie ije, seti ulọ ikwū ya n'ofè ulo-elu Ida.
22. O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya.Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:
23. umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun: