1. Chineke we si Jekob, Bilie, rigoro Betel, biri n'ebe ahu: mekwara Chineke ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, bú Onye mere ka i hu Ya anya mb͕e ināb͕apu n'iru Isọ nwa-nne-gi.
2. Jekob we si ulo-ya, ọ si kwa ndi nile ya na ha bi, Wezuganu chi nile nke ndi ala ọzọ nke di n'etiti unu, menu onwe-unu ka unu di ọcha, b͕anwe-kwa-nu uwe-unu:
3. ka ayi bili kwa, rigoro Bet-el; m'gēmekwara Chineke ebe-ichuaja n'ebe ahu, bú Onye nāzam n'ubọchi ahuhum, we nọyerem n'uzọ nke m'jere.