30. Jekob we kpọ aha ebe ahu Peniel: n'ihi na ahuwom Chineke iru na iru, ka o kwuru, ewe naputa ndum.
31. Anyanwu we wa-kwasi ya mb͕e ọ gabigara Penuel, ya onwe-ya we nēje nsukwara-achi.
32. N'ihi nka umu Israel adighi-eri akwara nke ọkpukpu-ukwu nke di n'isi-ọsu, rue ta: n'ihi na o meturu isi-ọsu Jekob n'akwara nke ọkpukpu-ukwu.