Jenesis 28:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ tua egwu, si, Le, otú ebe a di egwù nke-uku! nka abughi ihe ọzọ ma-ọbughi nání ulo Chineke, nka bu kwa ọnu-uzọ-ama elu-igwe.

18. Jekob we bilie n'isi-ututu, were nkume ahu nke ọ dọbara n'okpuru isi-ya, do ya ka ọ buru ogidi, ọ wusa manu n'elu ya.

19. Ọ kpọ aha ebe ahu Bet-el: ma otú ọ di Luz bu aha obodo ahu na mbu.

20. Jekob we kwe nkwa, si, Ọ buru na Chineke gānọyerem, debem n'uzọ a nke mu onwem nēje, nyem nri ka m'we rie, na uwe ka m'we yie,

21. m'we lata n'ulo nnam n'udo, Jehova gābu-kwa-ram Chineke,

22. nkume a, nke m'doworo ka ọ buru ogidi, gābu kwa ulo Chineke: ihe nile I gēnyem, aghaghkwam inye Gi otù uzọ n'uzọ iri.

Jenesis 28