Jenesis 27:17-23 Bible Nso (IGBOB)

17. o nye Jekob, bú nwa-ya, nri utọ na achicha n'aka, bú nke o doziri.

18. O we biakute nna-ya, si Nna m: ọ si, Lekwam; ònye ka i bu, nwam?

19. Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem.

20. Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem.

21. Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya.

22. Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ.

23. Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya.

Jenesis 27