Jenesis 26:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Oké unwu we di n'ala ahu, tukwasi oké unwu mbu nke di n'ubọchi Abraham. Aisak we jekuru Abimelek, bú eze ndi Filistia, rue Gera.

2. Jehova we me ka ọ hu Ya anya, Ọ si, Aridala n'Ijipt; biri n'ala ahu nke M'gāsi gi biri:

3. nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;

4. M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;

5. n'ihi na Abraham gere nti n'olum, we debe ihe-ndebem, ihe nile M'nyere n'iwu, ukpurum nile, na iwum nile.

6. Aisak we biri na Gera:

7. ndikom ebe ahu we jua ya ajuju bayere nwunye-ya; ọ si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu: n'ihi na ọ turu egwu isi, Ọ bu nwunyem; ka ndikom ebe a we ghara ib͕um n'ihi Rebeka, ka o kwuru: n'ihi na nwayi nke di nma ile anya ka ọ bu.

8. O rue, mb͕e ubọchi ọ nọduru n'ebe ahu di anya, na Abimelek, bú eze ndi Filistia, leputara anya na window, hu, ma le, Aisak na Rebeka, bú nwunye-ya, nēgwu egwú.

9. Abimelek we kpọ Aisak, si, Le, nwunye-gi ka ọ bu n'ezie: ì si kwa aṅa si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? Aisak we si ya, N'ihi na asirim, Ka m'ghara inwu anwu n'ihi ya.

10. Abimelek we si, Gini bu nka i meworo ayi? ọ fọduru nwantī na otù onye nime ndi nkem gēsowori nwunye-gi dina, i gēmewo-kwa-ri ka ikpe-ọmuma biakwasi ayi.

11. Abimelek we nye ndi-ya nile iwu, si, Onye nēmetu nwoke a ma-ọbu nwunye-ya aka, aghaghi ime ka ọ nwua.

12. Aisak we gha nkpuru n'ala ahu, hu n'arọ ahu ọgu ise ọgu ise: Jehova we gọzie ya.

13. Nwoke ahu we di uku, ọ ga n'iru, nāga n'iru n'idi uku rue mb͕e ọ di uku nke-uku:

14. ọ we nwe ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu, na ihe-nnweta, bú igwè ehi, na ọtutu ndi-orù: ndi Filistia we nēkwo ya ekworo.

15. Ma olùlù-miri nile nke ndi-orù nna-ya gwururi n'ubọchi Abraham nna-ya, ndi Filistia kpochiri ha, were kwa ájá kpojue ha.

16. Abimelek we si Aisak, Si n'ebe ayi nọ la; n'ihi na i nwe ume kari ayi nke-uku.

17. Aisak we si n'ebe ahu je, ma-ulo-ikwū-ya na ndagwurugwu Gera, biri n'ebe ahu.

Jenesis 26