25. Nke-mbu we puta nācha ọbara ọbara, aru-ya nile di ka uwe aji; ha we kpọ aha-ya Isọ.
26. Emesia nwa-nne-ya nwoke puta-kwa-ra, aka-ya nējide ikiri-ukwu Isọ; ewe kpọ aha-ya Jekob: Aisak b͕ara ọgu arọ atọ mb͕e Rebeka muru ha.
27. Umu-okoro ahu we tó etó: Isọ we buru nwoke mara ichu ntá, onye ọhia; ma Jekob bu nwoke zuru okè, nēbi n'ulo-ikwū.
28. Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya.
29. Jekob we sie ofé: Isọ we si n'ọhia bata, ya onwe-ya nāda kwa #mbà: