Jenesis 24:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:

4. kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.

5. Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m'nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n'ala ahu nke i siri n'ebe ahu puta?

6. Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu.

7. Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n'ulo nnam, na n'ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n'iru gi, i gēsi kwa n'ebe ahu lutara nwam nwunye.

8. Ma ọ buru na nwayi ahu achọghi iso gi je, ya bu i puwo n'iyi nka i ṅurum; nání na i gaghi-eme ka nwam laghachi n'ebe ahu.

9. Orù ahu we tiye aka-ya n'okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a.

Jenesis 24