Jenesis 24:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Abraham ghọrọ agadi, ubochi nduya nāgwu: Jehova gọzikwarari Abraham n'ihe nile.

2. Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:

3. m'gēme kwa gi ka i were Jehova, bú Chineke nke elu-igwe na Chineke nke uwa, ṅu iyi, na i gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'etiti ha:

4. kama ọ bu alam na umu-nnam ka i gējekuru, lutara nwam, bú Aisak, nwunye.

5. Orù ahu we si ya, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-achọ isom jerue ala nka: ọ̀ bu na m'nāghaghi ime ka nwa-gi laghachi n'ala ahu nke i siri n'ebe ahu puta?

6. Abraham we si ya, Lezie onwe-gi anya ka i ghara ime ka nwam laghachi n'ebe ahu.

7. Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Nke si n'ulo nnam, na n'ala amurum, kuputam, Nke gwakwara m okwu, Nke ṅukwara m iyi, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ala nka; Ya onwe-ya gēziga mọ-ozi-Ya n'iru gi, i gēsi kwa n'ebe ahu lutara nwam nwunye.

8. Ma ọ buru na nwayi ahu achọghi iso gi je, ya bu i puwo n'iyi nka i ṅurum; nání na i gaghi-eme ka nwam laghachi n'ebe ahu.

9. Orù ahu we tiye aka-ya n'okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a.

10. Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.

11. Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n'ala n'azu obodo ahu n'akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa.

12. Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere.

Jenesis 24