9. ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.
10. Ma Efron nānọdu n'etiti umu Het: Efron onye Het we za Abraham na nti umu Het, bú ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya, si,
11. E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m'nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m'nye-woro ya; n'anya umu ndi nkem ka m'nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu.
12. Abraham we kpọ isi ala n'iru ndi ala ahu.
13. Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m'we lìe onye-nkem nwuru anwu n'ebe ahu.
14. Efron we za Abraham, si ya,
15. Onye-nwem, nuru olum: ala nke ruru nnù shekel ọla-ọcha, ǹke ahu bu gini n'etiti mu na gi? lì kwa onye-nke-gi nwuru anwu.
16. Abraham we ge Efron nti; Abraham we tùara Efron ọla-ọcha ahu, nke o kwuru na nti umu Het, nnù shekel ọla-ọcha nke ndi-ahia gānara.
17. Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n'iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n'ọhia ahu, nke di n'ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike
18. ibu ihe-nzuta n'anya umu Het, n'etiti ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya.
19. Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n'ọb͕à ọhia Makpila ahu n'iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean.
20. Umu Het we me ọhia ahu na ọb͕à nke di nime ya ka ha guzosiere Abraham ike ibu ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì.