Jenesis 23:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndu Sera we buru ọgu arọ isi na asa: ndia bu arọ ndu Sera.

2. Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n'obi, na ikwara ya ákwá.

3. Abraham we si n'iru onye nke ya nwuru anwu bilie, gwa umu Het okwu, si,

4. Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.

5. Umu Het we za Abraham, si ya,

6. Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n'etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n'ílì ahu nke kachasi nma n'ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu

7. Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het.

8. Ọ we kpayere ha uka, si, Ọ buru na ọ di na nkpuru-obi-unu ilìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu, nurunu olum, riọkwara m Efron nwa Zoha,

9. ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.

Jenesis 23