Jenesis 21:29-34 Bible Nso (IGBOB)

29. Abimelek we si Abraham, Gini ka umu-nne-aturu asa ndia nke i debere n'onwe-ha iche bu?

30. Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n'akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m'gwuru olùlù-miri a.

31. N'ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n'ihi na n'ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi.

32. Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia.

33. Abraham we kua osisi tamarisk na Bia-sheba, kpọkue aha Jehova, bú Chineke Ebighi-ebi, n'ebe ahu.

34. Abraham we nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia ọtutu ubọchi.

Jenesis 21