24. Abraham we si, Mu onwem gāṅu iyi.
25. Abraham we bara Abi-melek mba n'ihi olùlù-miri nke ndi-orù Abimelek napuru ya-ri n'ike.
26. Abi-melek we si, Amaghm onye mere ihe a: ọzọ kwa, gi onwe-gi, i gosighm, ma mu onwem kwa, anughm ya, ma-ọbughi nání taa.
27. Abraham we chiri ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi nye Abimelek; ha abua we b͕a ndu.
28. Abraham we debe umu-nne-aturu asa n'onwe-ha iche, bú nke ìgwè ewu na aturu.
29. Abimelek we si Abraham, Gini ka umu-nne-aturu asa ndia nke i debere n'onwe-ha iche bu?
30. Ọ we si, Umu-nne-aturu asa ndia ka i gānara n'akam, ka ọ we ghọrọm ihe-àmà na m'gwuru olùlù-miri a.
31. N'ihi ya ọ kpọrọ ebe ahu Bia-sheba; n'ihi na n'ebe ahu ka ha abua ṅuru iyi.
32. Ha we b͕a ndu na Bia-sheba: Abimelek we bilie, ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, ha laghachi n'ala ndi Filistia.
33. Abraham we kua osisi tamarisk na Bia-sheba, kpọkue aha Jehova, bú Chineke Ebighi-ebi, n'ebe ahu.
34. Abraham we nọ dika ọbìa n'ala ndi Filistia ọtutu ubọchi.