Jenesis 21:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Chineke we nu olu nwa-okoro ahu; mọ-ozi nke Chineke we si n'elu-igwe kpọ Hega òkù, si ya, Gini nēme gi, Hega? atula egwu; n'ihi na Chineke anuwo olu nwa-okoro ahu n'ebe ọ nọ.

18. Bilie, palie nwa-okoro ahu, jide ya n'aka-gi; n'ihi na mba uku ka M'gēme ya ka ọ ghọ.

19. Chineke we meghe anya-ya abua, ọ hu olùlù-miri; ọ we je, b͕ajue karama-akpukpọ-ya na miri, me ka nwa-okoro ahu ṅua.

20. Chineke we nọyere nwa-okoro ahu, ọ we tó etó, biri n'ọzara, ghọ ọ̀kà-uta, ka o nētó etó.

21. O biri n'ọzara Peran: nne-ya we si n'ala Ijipt lutara ya nwunye.

22. O rue na mb͕e ahu, na Abimelek na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya, gwara Abraham okwu, si, Chineke nọyere gi n'ihe nile nke gi onwe-gi nēme:

Jenesis 21