11. Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke.
12. Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.
13. Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.
14. Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.
15. Miri we gwu na karama-akpukpọ ahu, ọ we tuda nwa ahu n'okpuru otù nime osisi ntà,
16. je, nọdu ala n'onwe-ya na ncherita-iru ya n'ebe di anya, dika ndi nāb͕a uta gāb͕aru; n'ihi na ọ siri, Ka m'ghara ilekwasi ọnwu nwam anya. Ọ we nọdu na ncherita-iru ya, welie olu-ya, kwa ákwá.