1. Abua nime ndi-mọ-ozi ahu we biarue Sọdọm n'anyasi; ma Lot nānọdu n'ọnu-uzọ-ama Sọdọm: Lot we hu ha anya, bilie izute ha, ọ da kpue iru-ya n'ala,
2. si, Biko, le, ndi-nwem, biko, sinu n'ije-unu wezuga onwe-unu bà n'ulo orù-unu, nọ ọnọdu-abali, sa kwa ukwu-unu, unu gēbili n'isi-ututu, la, Ha si, É-è, kama ọ bu n'amá ka ayi gānọ ọnọdu-abali.
3. O rugide ha nke-uku; ha we si n'ije-ha wezuga onwe-ha jekuru ya, ba n'ulo-ya; O we mere ha oké oriri, sie achicha ekoghi-eko, ha rie.
4. Ma tutu ha edina, ndikom obodo ahu, bú ndikom Sọdọm, b͕ara ulo ahu buru-buru, ma okorọbia ma agadi, ndi ala ahu nile site n'akuku ọ bula;
5. ha we kpọ Lot òkù, si ya, Òle ebe ha nọ, bú ndikom ndi bakutere gi n'abali a? me ka ha putakute ayi, ka ayi we mara aru-ha.
6. Lot we pukuru ha rue ọnu-uzọ, mechie uzọ n'azu ya.
7. Ọ si, Biko, umu-nnem, unu emela ihe ọjọ.
8. Biko, le, enwerem umu-ndinyom abua ndi akāmaghi aru nwoke: biko, ka m'kuputara unu ha, me-kwa-nu ha dika ọ di nma n'anya-unu: nání unu emela ndikom ahu ihe; n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka ha biara n'okpuru ndò nke ulom.
9. Ha si, Pua n'uzọ. Ha si kwa, Otù onye a batara inọ dika ọbia, ọ we nēkpe ikpe nke ukwu: ub͕u a ayi gēme gi ihe kari ihe ayi gēme ha. Ha we rugide nwoke ahu, bú Lot, nke-uku, biarue nso itiwa ibo-uzọ.