18. Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi!
19. Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya.
20. Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku.
21. Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M'gēme ka o guzosi ike n'ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru.
22. Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo.
23. Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka.
24. Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya.
25. Ishmael, bú nwa-ya nwoke, b͕a-kwa-ra arọ iri na atọ, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya.
26. N'otù ubọchi ahu ka ebiri Abraham na Ishmael nwa-ya nwoke úgwù.
27. Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n'ulo, na ndi eji ego b͕ata n'aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.