Jenesis 17:10-16 Bible Nso (IGBOB)

10. Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n'etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù.

11. Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu.

12. Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta.

13. Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.

14. Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n'anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum.

15. Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n'ihi na Sera bu aha-ya.

16. M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di.

Jenesis 17