9. Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu.
10. O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n'etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu.
11. Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha.
12. O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.