Jenesis 15:8-21 Bible Nso (IGBOB)

8. Ọ si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, #m'gēji gini mara na m'gēnweta ya?

9. Ọ si ya, Chirim nwa-ab͕ọghọ-ehi nke b͕ara arọ atọ, na nne-ewu nke b͕ara arọ atọ, na ebulu nke b͕ara arọ atọ, na nduru, na nwa-kpalakwukwu.

10. O we chiri Ya ihe ndia nile, kpọwa ha n'etiti abua, tiye otù nkpọwa na ncherita-iru ibe-ya: ma ọ kpọwaghi nnunu abua ahu.

11. Udele we fedakwasi ozu-anu ahu, ma Abram chuliri ha.

12. O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.

13. Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;

14. ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.

15. Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.

16. Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.

17. O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu.

18. N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:

19. ndi-Kinait, na ndi-Kenizait, na ndi-Kadmonait,

20. na ndi Het, na ndi-Perizait, na Refaim,

21. na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Giagashait, na ndi Jebus.

Jenesis 15