Jenesis 14:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm.

13. Onye b͕apuru ab͕apu we bia gosi Abram, bú onye-Hibru: ma ya onwe-ya bi n'etiti osisi terebinth nke Mamre, bú onye-Amorait, nwa-nne Eshkol, na nwa-nne Ana; ndi ahu bu kwa ndi ha na Abram di n'ọb͕ub͕a-ndu.

14. Mb͕e Abram nuru na adọtara nwa-nne-ya n'agha, ọ chiputa ndi-ya eziri ibu agha, bú ndi amuru n'ulo-ya, ọgu iri-na-ise na iri na asatọ, ọ we nāchu ha rue Dan.

15. Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs.

Jenesis 14