Jenesis 11:26-30 Bible Nso (IGBOB)

26. Tira di ndu ọgu arọ atọ na iri, mua Abram, na Nehoa, na Heran.

27. Ma ndia bu osuso-ọmumu Tira. Tira muru Abram na Nehoa na Heran; Heran muru Lot.

28. Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea.

29. Abram na Nehoa we lutara onwe-ha nwunye; aha nwunye Abram bu Serai; aha nwunye Nehoa bu Milka, nwa-nwayi Heran, bú nna Milka na nna Iska.

30. Ma Serai bu nwayi-àgà; ọ dighi nwa ọ nwere.

Jenesis 11