Jenesis 10:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.

8. Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa.

9. Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova.

10. Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.

11. O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala,

12. na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).

13. Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,

14. na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.

15. Kenean muru Zaidon, bú ọkpara-ya, na Het;

16. na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;

Jenesis 10