4. Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim.
5. Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
6. Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.
7. Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.
8. Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa.
9. Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova.
10. Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.
11. O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala,
12. na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).
13. Mizraim muru Ludim, na Anamim, na Lehabim, na Naftuhim,
14. na Patrusim, na Kasluhim (ebe ndi Filistia siri puta), na Kaftorim.