27. na Hadoram, na Uzal, na Dikla;
28. na Obal, na Abimael, na Sheba;
29. na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan.
30. Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu.
31. Ndia bu umu-ndikom Shem, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, dika mba nile ha si di.
32. Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Noa, dika osuso-ọmumu nile ha si di, nime mba nile ha: site kwa na ndia ka ekesara mba nile n'uwa, mb͕e iju-miri ahu gasiri.