Jenesis 10:18-27 Bible Nso (IGBOB)

18. na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa.

19. Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha.

20. Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha.

21. Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet.

22. Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.

23. Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash.

24. Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.

25. Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.

26. Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;

27. na Hadoram, na Uzal, na Dikla;

Jenesis 10