Jenesis 1:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.

2. Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri.

3. Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.

4. Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu.

5. Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.

6. Chineke we si, Ka mbara di n'ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n'etiti miri na miri.

7. Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a.

8. Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua.

9. Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a.

10. Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma.

11. Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a.

12. Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma.

13. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ.

Jenesis 1