18. O we kpe ekpere ọzọ; elu-igwe we nye miri-ozuzo, ala we mia nkpuru-ya.
19. Umu-nnam, asi na onye ọ bula n'etiti unu si n'ezi-okwu jehie, ma otù onye we me ka o chigharia;
20. ka ọ mara na onye meworo ka onye-nmehie si na njehie nke uzọ-ya chigharia gazọputa nkpuru-obi n'ọnwu, o gēkpuchi kwa ọtutu nmehie.