Jemes 3:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu aghọla ọtutu ndi-ozizí, umu-nnam, ebe unu matara na ayi gānata ikpé ka uku.

2. N'ihi na ayi nile nāsu ngọngọ n'ọtutu ihe. Ọ buru na onye ọ bula asughi ngọngọ n'okwu, onye ahu bu nwoke tozuru okè, buru kwa onye puru ikwa aru-ya dum nga.

3. Ma ọ buru na ayi etiye bridle inyinya-ayi n'ọnu-ha, ka ha we kweyere ayi, ayi nēchighari kwa aru-ha dum.

4. Le, ub͕ọ kwa, ọ bu ezie na ha di uku otú a, oké ifufe nēfeghari kwa ha, ma umara isi-ub͕ọ dikarisiri ntà nēchighari ha, ebe ọ bula uche onye-isi ub͕ọ nāchọ.

Jemes 3