Jemes 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu.

2. Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche;

3. ebe unu mara na nnwaputa nke okwukwe-unu nāluputa ntachi-obi.

4. Ma ka ntachi-obi luzue ọlu-ya, ka unu we tozue okè dizu kwa nma, buru ndi ọ dighi ihe ọ bula fọduru nke unu nēnweghi.

5. Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.

6. Ma ya riọ n'okwukwe, ghara inwe obi abua: n'ihi na onye nwere obi abua yiri ebili-miri nke oké osimiri mb͕e ifufe nēfeghari ya, anātuli kwa ya elu.

Jemes 1