Ilu 9:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.

7. Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.

8. Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.

9. Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.

10. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.

11. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba,Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu.

12. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe:Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.

13. Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu;Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula.

Ilu 9