9. Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ,Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.
10. Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.
11. N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby;Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.