Ilu 8:33-35 Bible Nso (IGBOB)

33. Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,Unu eze-kwa-la ya ndu.

34. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35. N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.

Ilu 8