Ilu 6:26-31 Bible Nso (IGBOB)

26. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28. Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?

29. Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

30. Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31. Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

Ilu 6