Ilu 6:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi;Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi;Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka.

23. N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè;Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:

24. Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ,N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi.

25. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi;Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.

26. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha:Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.

27. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya,Ma uwe-ya agaghi-ere ọku?

28. Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku,Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua?

29. Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di;Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

30. Madu adighi-eleda onye-ori anya, mb͕e o nēzu oriImeju nkpuru-obi-ya mb͕e agu nāgu ya:

31. Ma asi na achọta ya, ọ gākwughachi okpukpu asa;Àkù nile nke ulo-ya ka ọ gēnye.

Ilu 6