14. Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile:Ọ nēzisa ise-okwu.
15. N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede;N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
16. Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì;E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya:
17. Anya di elu, na ire okwu-ugha,Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ;
18. Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe,Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ;
19. Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume,Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.