3. N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu,Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:
4. Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood,Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.
5. Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu;Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;
6. Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.
7. Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.
8. Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ,Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso: