Ilu 5:20-22 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?

21. N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di,Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

22. Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu,Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.

Ilu 5