Ilu 31:18-31 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.

19. Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.

20. Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.

21. Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.

22. Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.

23. Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.

24. Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.

25. Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.

26. Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.

27. Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.

28. Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:

29. Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.

30. Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu:Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto

31. Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara;Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.

Ilu 31