3. Amutaghkwam amam-ihe,Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.
4. Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida?Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya?Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?
5. Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.
6. Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile,Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.
7. Ihe abua ka m'riọworo Gi;Ajulam ha tutu mu anwua:
8. Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ:Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù;Me ka m'rie nri rurum:
9. Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova?Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori,We were aha Chinekem me ihe ọjọ.
10. Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.
11. Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.
12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.
13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.
15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo: