17. Anya nke nākwa nna-ya emò,Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,Umu-ugo gēri kwa ya.
18. Ihe atọ di nke karirim ighọta,E, anọ nke m'nāmagh:
19. Uzọ ugo n'elu-igwe;Uzọ agwọ n'elu oké nkume;Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.
20. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.
21. N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji,N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu: