12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.
13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.
15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:
16. Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;Na ala afọ miri nējughi;Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.
17. Anya nke nākwa nna-ya emò,Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,Umu-ugo gēri kwa ya.
18. Ihe atọ di nke karirim ighọta,E, anọ nke m'nāmagh:
19. Uzọ ugo n'elu-igwe;Uzọ agwọ n'elu oké nkume;Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.
20. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.