10. Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.
11. Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.
12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.
13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.
14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.
15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:
16. Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;Na ala afọ miri nējughi;Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.
17. Anya nke nākwa nna-ya emò,Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,Umu-ugo gēri kwa ya.
18. Ihe atọ di nke karirim ighọta,E, anọ nke m'nāmagh:
19. Uzọ ugo n'elu-igwe;Uzọ agwọ n'elu oké nkume;Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.
20. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.
21. N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji,N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu:
22. N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze;Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ;
23. N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di;Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya.
24. Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa,Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:
25. Danda bu ndi nādighi ike,Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;
26. Coney bu ndi nēnweghi ume,Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu;
27. Ọ dighi eze igurube nwere,Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile;
28. Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado,Ma ihe ahu di n'ulo uku eze.
29. Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma,E, anọ di nke nēje ije nke-ọma: