Ilu 30:10-19 Bible Nso (IGBOB)

10. Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.

11. Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.

12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.

13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.

14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.

15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:

16. Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;Na ala afọ miri nējughi;Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.

17. Anya nke nākwa nna-ya emò,Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,Umu-ugo gēri kwa ya.

18. Ihe atọ di nke karirim ighọta,E, anọ nke m'nāmagh:

19. Uzọ ugo n'elu-igwe;Uzọ agwọ n'elu oké nkume;Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.

Ilu 30