7. Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.
8. Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.
9. Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.
10. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.
11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.
12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.
13. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.
14. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.
15. Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.