Ilu 29:5-12 Bible Nso (IGBOB)

5. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.

6. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.

7. Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.

8. Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.

9. Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.

10. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.

11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.

Ilu 29